Full Lyrics
CHORUS
Otito, otito dịrị Chineke n'elu,
N'elu kacha elu n'ụwa,
Udo dịrị ndị mmadụ ndị nwe ezi obi ọma.
VERSE 1
Anyị a jaa gị mma, anyị a gọzie gị,
Anyị e sekpuoro gị, anyị e too gị,
Anyị e kele gị n'ihi nnukwu ebube gị.
Oseburụwa Chukwu, Eze nke eluigwe,
Chukwu Nna ji ike niile.
VERSE 2
Dinwenu Jesu Kristi, sọ Otu nwa Chineke mụrụ,
Dinwenu Chukwu, Nwa atụrụ nke Chineke.
VERSE 3
Nwa nke Nna, gị onye n'ekpochapụ njọ ụwa, meere anyị ebere.
Gị onye n'ekpochapụ njọ ụwa, naba arịrịọ anyị.
Gị onye nọ n'aka nri Nna, meere anyị ebere.
VERSE 4
N'ihi na sọ gị dị nsọ, sọ gị bụ Dinwenu,
Sọ gị Jesu Kristi kacha sị dị elu.
Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna. Amen!
OUTRO
Amen!!