Otito Diri Chukwu by Leonard C Ofonagoro — Lyrics

Leonard C Ofonagoro Igbo Gloria Mass Settings Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Otito dịrị Chukwu n'elu kacha sielu, Udo dịrị ndị mmadụ ndị were obiọma. [REFRAIN] Otito dịrị Chukwu. Ndị were obiọma. [VERSE 1] Anyị naajaa gị mma, naagọzi gị Anyị n'esekpuru gị. Anyị n'etoo gị, Anyị ekele n'ihi nnukwu ebube gị. [VERSE 2] Oseburụwa Chukwu Eze nke eluigwe. Chukwu Nna j'ike nile Dinwenu Jesu Kristi, Sọ otu nwa Chineke mụrụ. Dinwenu Chukwu, [VERSE 3] Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna. Gị onye naekpochapụ njọ nke ụwa, Meere anyị ebere. [VERSE 4] Gị onye naekpochapụ njọ nke ụwa, Nara arịrịọ anyị. [VERSE 5] Gị onye naekpochapụ njọ nke ụwa, Meere anyị ebere. N'ihi na sọ Gị dị nsọ. Sọ Gị bụ Dinwenu Sọ Gị Jesu Kristi, Kachasị dị elu Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna. Amen. Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

Otito Diri Chukwu

Otito Diri Chukwu

By Leonard C Ofonagoro
Staff & Solfa
Igbo
5 pages
0 Downloads
Gloria Mass Settings
0 0

More lyrics you may want