Full Lyrics
CHORUS
Otito dịrị Chineke n'elu,
Otito dịrị Chineke n'elu;
N'ụwa udo dịrị ndị nwere obiọma,
N'ụwa udo dịrị ndị nwere obiọma.
VERSE 1
Anyị ajaa Gị mma, Anyị agọzie Gị,
Anyị esekpuoro Gị, Anyị etoo Gị.
Anyị ekene Gị n'ihi nnukwu ebube Gị.
Oseburuwa Chukwu, Eze nke elu igwe.
VERSE 2
Chukwu Nna ji'ike niile.
Dinwenu Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ,
Dinwenu Chukwu, Nwa atụrụ nke Chineke Nwa nke Nna.
Gị Onye naekpochapụ njọ nke ụwa, meere anyị ebere.
VERSE 3
Gị Onye naekpochapụ njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị.
Gị Onye nọ n'aka nri Nna meere anyị ebere.
N'ihi na sọ Gị dị Nsọ, Sọ Gị bụ Dinwenu,
Sọ Gị, Jesu Kristi, kacha dị elu
Gị na Mmụọ Nsọ: N'ebube Chukwu Nna.
Amen.