Full Lyrics
REFRAIN
Otito dịrị Chineke n'elu kachasị,
N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ,
Ndị mmadụ, ndị mmadụ,
Ndị nwere obiọma.
VERSE 1
Anyị ajaa Gị mma,
Anyị agọzie Gị,
Anyị esepụọrọ Gị;
Anyị etoo Gị;
Anyị ekele Gị n'ihi nnukwu ebube Gị.
VERSE 2
Osebuluwa Chukwu, Eze n'igwe.
Chukwu Nna ji ike niile,
Dinwenu Jesu Kristi,
S'otu Nwa Chineke mụrụ.
VERSE 3
Dinwenu Chukwu.
Nwatụrụ nke Chineke,
Nwa nke Nna,
Gị Onye n'ekpochapụ njọ nke n'ụwa,
Meere anyị ebere.
VERSE 4
Gị Onye n'ekpochapụ njọ,
Njọ n'ụwa nara arịrịọ anyị,
Gị Onye nọ n'aka nri Nna,
Mee r'anyị, mee r'anyị ebere.
VERSE 5
N'ihi na sọ Gị dị Nsọ,
Sọ Gị bụ Dinwenu,
Sọ Gị, O Jesu Kristi,
Sọ Gị eh, sọ Gị dị Nsọ.
VERSE 6
Kachasị dị elu,
Gị na Mmụọ Nsọ
N'ebube Chukwu Nna,
Chukwu Nna.
Amen.