Full Lyrics
PRIEST
Otito diri Chineke n'elu kachielu
TUTTI
N'uwa udo diri ndi mmadu ndi nwere obi oma
Anyi ajaa Gi mma, anyi agozie Gi
Anyi esekpuoro Gi, anyi eto Gi
Anyi enyeke Gi n'ihi nnukwu ebube Gi
Oseburuwa Chukwu, Eze nke Eligwe
Chukwu Nna jikeniile
Dinwenu Jesu Kristi, so Otu Nwa Chineke muru
Dinwenu Chukwu, Nwaturu nke Chineke, Nwa nke Nna
Gi Onye n'ekpochapu njo nk'uwa, meere anyi ebere
Gi Onye n'ekpochapu njo nk'uwa, nara aririo anyi
Gi Onye no n'aka nri Nna, meere anyi ebere
N'ihi na so Gi di nso, so Gi bu Dinwenu
So Gi Jesu Kristi kachasi di elu
Kachasi di elu, Gi na Muo Nso n'ebube Chukwu Nna
Amen, amen, amen, amen, amen, amen, amen
Amen.