Full Lyrics
CANTOR
Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu!
CHORUS
N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma.
Anyị ajaa Gị mma;
Anyị agọzie Gị;
Anyị esekpuoro Gị;
Anyị etoo Gị.
Anyị ekelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị.
Oseburụwa Chukwu;
Eze nke eluigwe Chukwu Nna jike niile.
Dinwenu Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ;
Dinwenu Chukwu, Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna.
Gị onye n'ekpochapụ njọ nke ụwa, meere anyị ebere;
Gị onye n'ekpochapụ njọ nke ụwa, nụrụ arịrịọ anyị;
Gị onye nọ n'aka nri Nna, meere anyị ebere.
N'ihi na sọ Gị dị Nsọ;
sọ Gị bụ Dinwenu;
sọ Gị Jesu Kristi kachasị dielu,
Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna.
Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen! Amen.