Full Lyrics
REFRAIN
Otito dịrị Chineke n'elu kachasị,
N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ nwere obi ọma.
VERSE 1
Anyị a jaa gị mma, anyị a gọzie gị, anyị asekpuoro gị,
Anyị a too gị,
Anyị ekele gị n'ihi nnukwu ebube gị,
Oseburụwa Chukwu, otito dịrị Chineke.
VERSE 2
Eze nke eluigwe Chukwu Nna pụrụ ime ihe niile,
Dinwenụ Jesu Kristi sọ otu nwa Chineke mụrụ,
O Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna,
Otito dịrị Chineke.
VERSE 3
Gị onye naekpochapụ njọ, njọ nke ụwa, meere anyị ebere,
Gị onye naekpochapụ njọ, njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị,
Otito dịrị Chineke.
VERSE 4
Gị onye nọ n'aka nri Nna meere anyị ebere,
N'ihi na sọ gị dị nsọ, sọ gị bụ Dinwenụ,
Sọ gị Jesu Kristi kachasị elu,
Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna,
Otito dịrị Chineke.
CODA
Amen, Amen, Amen.