OTITO DIRI CHINEKE by Ifeanyi Nwaiwu — Lyrics

Ifeanyi Nwaiwu Igbo Gloria Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Otito dịrị Chineke n'elu kachasị, N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ nwere obi ọma. VERSE 1 Anyị a jaa gị mma, anyị a gọzie gị, anyị asekpuoro gị, Anyị a too gị, Anyị ekele gị n'ihi nnukwu ebube gị, Oseburụwa Chukwu, otito dịrị Chineke. VERSE 2 Eze nke eluigwe Chukwu Nna pụrụ ime ihe niile, Dinwenụ Jesu Kristi sọ otu nwa Chineke mụrụ, O Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna, Otito dịrị Chineke. VERSE 3 Gị onye naekpochapụ njọ, njọ nke ụwa, meere anyị ebere, Gị onye naekpochapụ njọ, njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị, Otito dịrị Chineke. VERSE 4 Gị onye nọ n'aka nri Nna meere anyị ebere, N'ihi na sọ gị dị nsọ, sọ gị bụ Dinwenụ, Sọ gị Jesu Kristi kachasị elu, Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna, Otito dịrị Chineke. CODA Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

OTITO DIRI CHINEKE

OTITO DIRI CHINEKE

By Ifeanyi Nwaiwu
Solfa
Igbo
2 pages
52 Downloads
Gloria
0 0

More lyrics you may want