OTITO DIRI CHINEKE by Fr. Bart C. Ezeokafor — Lyrics

Fr. Bart C. Ezeokafor Igbo Gloria Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ nwere obi ọma. REFRAIN Otito dịrị Chukwu Otito dịrị Chukwu VERSE 1 Anyị ajaa Gị mma eh Anyị agọzie Gị Anyị ekpuoro Gị Anyị ekelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị Oseburuwa Chukwu Nna ji ike nile. VERSE 2 Dinwenu Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ Dinwenu Chukwu, Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna Gị Onye naekpocha njọ nk'ụwa, meere anyị ebere Gị Onye naekpocha njọ nk'ụwa, nụr' arịrịọ anyị Gị Onye nọ n'aka nri Nna, meere anyị ebere. VERSE 3 N'ihi na sọ Gị dị Nsọ, sọ Gị bụ Dinwenu Sọ Gị kachasị dị elu, Jesu Kristi Nyere Mụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna. Amen, Amen!

Download the sheet music

OTITO DIRI CHINEKE

OTITO DIRI CHINEKE

By Fr. Bart C. Ezeokafor
Solfa
Igbo
2 pages
4 Downloads
Gloria
0 0

More lyrics you may want