Full Lyrics
CHORUS
Otito dịrị Chineke n'elu kacha elu,
dịrị ndị mmadụ nwere obi ọma.
VERSE 1
Anyị aja gị mma, anyị agọzie gị,
anyị esekpuoro gị, anyị etoo gị,
anyị ekele gị n'ihi nnukw'ebube gị.
Oseburụwa Chukwu, eze nke eluigwe.
VERSE 2
Chukwu Nna onye ji ike nile,
Dinwenụm Jeso Kristi sọ otu nwa Chineke mụrụ.
Dinwenụm Chukwu, Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna.
VERSE 3
Gị onye n'ekpochapụ njọ nke ụwa,
meere anyị ebere.
Gị onye n'ekpochapụ njọ nke ụwa,
nara arịrịọ anyị.
Gị onye nọ n'aka nri Nna,
meere anyị ebere.
VERSE 4
N'ihi na sọ gị bụ Dinwenụm, sọ gị.
O Jeso Kristi kachasị dị elu,
gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna.
Amen, Amen.