Full Lyrics
REFRAIN
Otito diri Chineke n'elu kachasi elu.
VERSE 1
N'uwa udo diri'n di mmadu
Ndi ihe ha n'aso Chukwu,
Anyi 'aja gi mma,
Anyi'a gozie gi,
Anyi eto 'gi,
Anyi ekele gi, n'ihi nnukwu ebube gi,
Oseburuwa Chukwu Eze'n ke 'lu'igwe
Chukwu nna ji ike nile.
VERSE 2
Dinwenu anyi Jesu Christi
So 'tu nwa Chineke muru
Nwaturu nke Chineke
Mere anyi ebere
Onye n'ekpochapu'n 'jo'n ke uwa
Nara aririo anyi.
VERSE 3
Onye no n'aka'n ri nna
Mere anyi ebere
N'ihi na so gi di aso
So gi bu dinwenu
So gi o Jesu Christi
Kachasi elu
Nyere Mmuo Nso
Na ebube Chukwu nna
Amen, Amen, Alleluia
Ebube Chukwu nna.