OTITO DIRI CHINEKE by Johnson Chinedu Ezaka — Lyrics

Johnson Chinedu Ezaka Igbo Gloria Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Otito dịrị Chineke n'elu kacha elu, n'ụwa udo dịrị ndị nwere obi ọma. VERSE 1 Anyị a jaa Gị mma, anyị a gọzie Gị, Anyị a sekpuoro Gị, anyị e too Gị, Anyị e kele Gị n'ihi nnukwu ebube Gị, Oseburụwa Chukwu, Eze nke eluigwe, Chineke Nna Onye ji ike niile. VERSE 2 Dinwenu Jesu Kristi sọ ofu nwa Chineke, Dinwenu Chineke nwa atụrụ nke Chineke, nwa nke Nna, Gị onye naekpochapụ njọ nke ụwa, mee anyị ebere, Gị onye naekpochapụ njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị, Gị onye nọ n'aka nri Nna, mee anyị ebere. N'ihi na sọ Gị dị nsọ, sọ Gị bụ Dinwenu, Sọ Gị kachasị dị elu, Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna, Amen.

Download the sheet music

OTITO DIRI CHINEKE

OTITO DIRI CHINEKE

By Johnson Chinedu Ezaka
Solfa
Igbo
2 pages
0 Downloads
Gloria
0 0

More lyrics you may want