Full Lyrics
CHORUS
Otito diri Chineke n'elu uwa,
udo diri ndi madu ndi nwere obi oma.
VERSE 1
Anyi ajaa gi mma, anyi agozie gi, anyi esekpuoro gi.
Anyi ekelee gi n'ihi nnuku ebubegi.
VERSE 2
Osebuwa, Eze n'ke eligwe, Chukwu Nna onye ji ike niile.
So tu Nwa Chineke muru, Jesu Kristi.
VERSE 3
Onye nwe anyi, Nwa aturu nke njo nk'uwa,
meere anyi ebere.
VERSE 4
Gi onye n'ekpochapu njo, njo nk'uwa, nara aririo anyi.
Gi onye no n'aka nri Nna, meere anyi ebere.
N'ihi na so gi, so gi di nso, so gi bu Onwenu.
VERSE 5
So gi o Jesu Kristi, kacha di ebube,
na Muo Nso n'ebube Chineke Nna. Amen.