Full Lyrics
CHORUS
Otito diri Chineke n'elu kacha elu,
n'uwa udo diri ndi mmadu ndi nwer'obi oma.
VERSE 1
Anyi ajaa Gi mma, anyi agozie Gi,
anyi esekpuoro Gi, anyi etoo Gi,
anyi ekele Gi n'ihi nnukwu ebube Gi.
VERSE 2
Oseburuuwa Chukwu, Eze nke elu igwe,
Dinwenu Jesu Kristi, so Otu Nwa Chineke.
VERSE 3
Dinwenu Chukwu, Nwaturu nke Chineke,
Nwa nke Nna,
Gi onye n'ekpochapu njo nk'uwa,
meere anyi ebere.
VERSE 4
Gi onye n'ekpochapu njo nk'uwa,
nara aririo anyi,
Gi onye no n'aka nri Nna
meere anyi ebere.
VERSE 5
N'ihi na so Gi di nso.
So Gi bu Dinwenu,
so Gi Jesu Kristi kachasi di elu,
Gi na Mmuo Nso n'ebube Chukwu Nna.
Amen.