Full Lyrics
CHORUS
Otito dịrị Chineke
Otito dịrị Chineke n'ụwa
udo dịrị ndị mmadụ
ndị nwer'obi ọma
VERSE 1
Anyị ajaa gị mma,
Anyị agọzie gị,
Anyị esekpuoro gị,
Anyị etoo gị,
Anyị ekele gị n'ihi nnukwu ebube gị
Oseburuwa Chukwu eze nke eluigwe
Chukwu Nna ji ike nile
VERSE 2
Dinwenu Jesu Kristi s'otu nwa Chineke mụrụ
Dinwenu Chukwu Nwatụrụ nke Chineke
nwa nke Nna
gị onye n'ekpochapụ njọ nk'ụwa
meer'anyị ebere,
gị onye n'ekpochapụ njọ nk'ụwa
n'ara arịrịgọ anyị
gị onye nọ n'aka nri Nna
meere anyị ebere.
VERSE 3
N'ihi na sọ gị dị nsọ
sọ gị bụ Dinwenu
sọ gị Jesu Kristi kacha dị elu
gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna
Amen. Amen Amen.