Full Lyrics
Otito dili Chineke n'enu k'asienu
N'uwa udo dịrị madụ ndị ihe ha nasọ Chukwu.
Anyị eto Gị,
Anyị ekwuputa ọlụ ọma Gị,
Anyị esekpuru Gị,
Anyị edo Gị ebube,
Anyị ekene Gị n'ihi nnukwu ebube Gị.
Osebruwa Chukwu, Eze nke igwe,
Chukwu Nna jike nile,
Onye nweanyị Jesu Christi,
S'otu Nwa Chineke,
Osebruwa Chukwu, Nwa nke Nna.
Onye n'ekpochapụ njọ nk'uwa,
Mee r'anyị ebere.
Onye nọ n'aka nri Nna,
Nụ rịọ anyị.
N'ihi na sọ Gị dị asọ,
Sọsọ Gị bụ Dinwenu,
Sọ Gị bụ Jesu Christi
Kachasị dịrị n'elu,
Nyere Mụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna.
Amen.