Full Lyrics
REFRAIN
Bịa nara oriri nsọ n'eyendu n'uju
Achịcha n'eyendu ọhụrụ
Mgbaghara n'amara na obi ebere
Bịa nara ọ bụ nke gị na nkem
Bịanụ ụnụ
VERSE 1
Ndị agụụ naagụ bịa kwute Jesu
Achịcha n'eyendu nsọ
Ahụ ya ka o nyawara maka anyị
Ọbara ya ka o gbara maka ndị njọ
VERSE 2
Ebe a n'oche oriri nke Onyenweanyị
Anyị gbakọrọ dịka otu ezin'ụlọ naecheta
Otu aja ahụ nke nyer'anyị ndụ ebighịebi
VERSE 3
Bata n'im'obim
Bata n'im'obim
Bata n'im'obim
Bata ka ị sacha m na njọ
Bịa bata n'ime ndụm
N'ime ndụ m, n'ime ndụ
Mụ sachapụ atụtụ njọ
Atụtụ njọ wepụ atụtụ njọ n'ime ndụm
Kam dịkwa ọcha
N'ime gị bata n'im'obim
Bata n'im'obim
Bata n'im'obim
Bata n'im'obim