Full Lyrics
CHORUS
Onyenweanyị mba dum gaada n'ihu gị,
gbuoro gị ikpere ala.
VERSE 1
Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị, O Chineke
zi omume nke gị ka o were nwee ike ịchi ndị nke gị
n'ụzọ ziri ezi, nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi.
VERSE 2
Eze ndị Tashish na eze obodo mmiri gbara gburugburu
gaefe ya, Eze ndị Sheba na Seba g'enye y'onyinye.
VERSE 3
Ọ gaatọghapụ ony'ogbenye kpọkuru ya
na ndị niile chọrọ enyemaka ya,
ọ g'emere ndị ogbenye na ndị esighị ike ebere
na azọkwa ndụ ndị nọ na mkpa.