Full Lyrics
VERSE 1
Onye dị ka Gị? Onye dị ka Gị?
Onye gaije n'elu mmiri.
Agụ n'eche mba! Isi mbido na isi njedebe.
Onye dị ka Gị? Oke mmiri n'ebu ụzọ.
REFRAIN
Onye dị ka Gị? Onye dị ka m? Eh! O je na mmụọ gwe! O je na mmụọ!
Onye dị ka Chi mo, Onye dị ka Nna n'afọ!
Onyoru ebube Ekwu e me!
Onye n'enye m ihe mo!
O ji ọbara kpụ nwa n'afọ!
Olori ihe lori nyi.
Onyiny' amara Gị ba r'ụba;
Onyinye ngọzi, Onyinye nwa, Onyiny' akụ n'iho n'ụkwụ n'ọgbọ agha!
O gbara nkịtị O kwu biri n'ọnụ Ya!
Bute nụ iho mmanya. Kelee Chineke maka ngọzi Ya.
Buru achịcha bu sọ mma bja n'ihu Gị, Nnannem, bja n'ihu Gị.
K'anyị jee n'altar.
Onye dị ka Gị? Onye dị ka Chineke Nna mo.
VERSE 2
Onye mere ngwụrọ o ga ije,
Onye zur' igwe mmadụ. Arịarịatụ egwu!
Onye dị ka Gị? Ugwua Bi ma njisim Kpe!
Onye dị ka Gị? Ọdọgwụ akataka! Chukwu! Chim e me.
VERSE 3
Onye dị ka Gị? Onye gwọrọ ndị ekpenta.
Onye dị ka Gị? Onye mere mmiri k'o ghọọ mmanya.
Chi n'echere mo, I bu Onye naenye aka mo! Ochendo mo!
VERSE 4
Onye kpọlitere ndị nwụrụ anwụ,
Onye dị ka Gị? Onye sị na ndị nwụrụ anwụ bilite.
Onye dị ka Gị? Okun'ereja! Okun'ereve! Isi iyi nke ndụ mo!
Nanị Gị bu ike mo, Onye dị ka Gị?
VERSE 5
Onye bja n'ihu Gị.
K'anyị buru achịcha na mmanya n'ihu Gị.
Nara nụ ha gọzie, Chineke, n'aka Ya k'o chukwu maka mmadụ nile, maka mgbaghara njọ.