Onyedikachukwu by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[VERSE 1] Onye dịka Gị? Onye mere nd'isi ha hụb'ụzọ. Onye dịka Gị? Onye ga r'ije n'elu mmiri. Agụ n'echemba! Ebube Dike! Isi mbido na Isi njedebem o, Onye dịka Gị? [REFRAIN] Gị? Onye dịka Chukwu, Chineke onyinye? Onye dịka Chi masịa masị! Ony'onyinye. Onye n'enye m'ihe mara nma? Onyiny'amara Gị bar'ụba; Onyinye ngozi, Onyinye nwa, Onyiny'akụ n'ih'onwunwe. Agam ebur'iko kiti okwu biri n'ọnụ Ya! Butenu iko mmanya nye Gị ekele. Agam eburu achịcha bụ sọ nma bịa n'iru Gị. Agam ebur'ih'onyinye Nwanne m, bịa, but'onyinye, k'anyi jee, wee tuoro Gị mmamma, n'ọdịgh'onye dịka Gị, Chineke Nna m o. [VERSE 2] Onye mere ngwụrọ ọ gab'ije, onye dịka Gị? Onye zur'igwe mmadụ nri, onye dịka Gị? Ugwu an'arị atụ egwu! Di nwany'isi mkpe! Onye dịka Gị? Odogwu akataka! Chukwu! Chi n'eme nma, Onye dịka Gị? [VERSE 3] Onye dịka Gị? Onye gwọrọ ndị ekpenta. Onye dịka Gị? sọ Gị mere mmiri k'ọ ghọọ mmanya. Chi n'echere m o, Ị bụ Ony'inye aka m o! Ochendo m o! Nna, Onye dịka Gị? [VERSE 4] Onye kpọlitere ndị nwụr'anwụ, onye dịka Gị? Onye si na ndị nwụr'anwụ bilite, onye dịka Gị? Ọkụ n'eri aja! Ọkụ n'ere ere! Is'iyi nke ndụ m o! Nanị Gị bụ ike m o, Nna, Onye dịka Gị? [VERSE 5] Onye chụr'aja n'elu obe, Onye gbar'ọbara, gbaa mmiri; achịcha na mmanya k'anyi buuru bịa n'iru Gị. Naranụ ha gọzie, Chineke, n'aka Ụkọchukwu Gị, maka mmadụ nile, maka mgbaghara njọ.

Download the sheet music

Onyedikachukwu

Onyedikachukwu

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
14 pages
6 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want