Onye Putara N'ututu by Udo Laurence Iwu — Lyrics

Udo Laurence Iwu Igbo Offertory Hymns Entrance songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Lee na Chineke Nna emeworo mu ihe m yọrọ ya Unu ahụgo na Chineke Nna azawo m ekpere n'oge ya Ihe raara mmadụ ahụ imere mu Chukwu emewo ya Aga m eji gịnị kelee ya e onye nwe mu [CHORUS] Onye pụtara n'ụtụtụ kelee Chi ya doo Onye tetara n'ụtụtụ bịa nye y'ekele O kwunuanụla onyinye mara mma k'anyi nye ya Onyinye kwesịrị ya e Ụfọdụ bụkwa ndị labara n'abalị mana h'ebiliteghi n'ụra E ọtụtụ labara n'anyasị mana h'ebiliteghi n'ụra Mana Chukwu mere k'anyi buru ndị dị ndụ n'ala ndị dị ndụ taata Anyị gaagbọrịmanụ gbọrịmanụ ee a Chineke emena ee A Chukwu bụkw'onye n'enye onyinye Bịanụ nye ya onyinye a Chineke buru ụzọ nye gị Onyinye k'anyi nye ya onyinye dị mma Onye nye mara mma onyinye dị mma Sin'obi pụtanụ e masịrị ya onyinye dị mma Mara mma masịrị ya onyinye ọbịọcha masịrị ya Mara mma ọ dị mma Ekele mara mma kwesịrị ya Ya n'ekele buru ibu kwesịrị Nye ya ekele mara mma ọ dị mma [VERSE 1] K'anyi jenu kelee Chineke n'ihe o mere 'rika Kelee ya na nke o mere me k'o me kw'ọzọ Ọ bụ Onye n'edu anyị ije a Chukwu n'edu anyị Echetala m ihe o meere mu n'oge gara aga Oge m kpọkuru ya n'ime nsogbu Chukwu bịara za m ekpere [VERSE 2] K'anyi jenu kelee Chukwu k'anyi je k'anyi jenu Nye y'onyinye k'anyi je k'anyi jenu bulie y'elu Bịa jaa nụ aha ya mma oge ruolanụ o K'anyi je onye ọbụla kulienụ k'anyi jee K'anyi jenu gọzie Chineke jaa nụ aha ya mma Ọ bụ ya kere anyị e k'anyi je Ọ bụ ya bụ Dinwenu k'anyi je Aha ya bụkwa Chineke jaa nụ aha ya mma

Download the sheet music

Onye Putara N'ututu

Onye Putara N'ututu

By Udo Laurence Iwu
Solfa
Igbo
5 pages
4 Downloads
Offertory Hymns Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want