Full Lyrics
[INTRO]
Lee na Chineke Nna emeworo mu ihe m yọrọ ya
Unu ahụgo na Chineke Nna azawo m ekpere n'oge ya
Ihe raara mmadụ ahụ imere mu Chukwu emewo ya
Aga m eji gịnị kelee ya e onye nwe mu
[CHORUS]
Onye pụtara n'ụtụtụ kelee Chi ya doo
Onye tetara n'ụtụtụ bịa nye y'ekele
O kwunuanụla onyinye mara mma k'anyi nye ya
Onyinye kwesịrị ya e
Ụfọdụ bụkwa ndị labara n'abalị mana h'ebiliteghi n'ụra
E ọtụtụ labara n'anyasị mana h'ebiliteghi n'ụra
Mana Chukwu mere k'anyi buru ndị dị ndụ n'ala ndị dị ndụ taata
Anyị gaagbọrịmanụ gbọrịmanụ ee a Chineke emena ee
A Chukwu bụkw'onye n'enye onyinye
Bịanụ nye ya onyinye a Chineke buru ụzọ nye gị
Onyinye k'anyi nye ya onyinye dị mma
Onye nye mara mma onyinye dị mma
Sin'obi pụtanụ e masịrị ya onyinye dị mma
Mara mma masịrị ya onyinye ọbịọcha masịrị ya
Mara mma ọ dị mma
Ekele mara mma kwesịrị ya
Ya n'ekele buru ibu kwesịrị
Nye ya ekele mara mma ọ dị mma
[VERSE 1]
K'anyi jenu kelee Chineke n'ihe o mere 'rika
Kelee ya na nke o mere me k'o me kw'ọzọ
Ọ bụ Onye n'edu anyị ije a Chukwu n'edu anyị
Echetala m ihe o meere mu n'oge gara aga
Oge m kpọkuru ya n'ime nsogbu Chukwu bịara za m ekpere
[VERSE 2]
K'anyi jenu kelee Chukwu k'anyi je k'anyi jenu
Nye y'onyinye k'anyi je k'anyi jenu bulie y'elu
Bịa jaa nụ aha ya mma oge ruolanụ o
K'anyi je onye ọbụla kulienụ k'anyi jee
K'anyi jenu gọzie Chineke jaa nụ aha ya mma
Ọ bụ ya kere anyị e k'anyi je
Ọ bụ ya bụ Dinwenu k'anyi je
Aha ya bụkwa Chineke jaa nụ aha ya mma