ONYE N'AZU M BU CHUKWU by Gerald C. Ani — Lyrics

Gerald C. Ani Igbo Communion Hymns Burial / Funeral Hymns Hymns Responsorial Psalms Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Onye n'azu m bu Chukwu, Onye n'azu m bu Ezi Chukwu Onye n'azu m bu Chukwu Ezi Chukwu nk'igwe ndi agha. Onye nani Ya nwe ike, Onye nani Ya di nso, Onye nani Ya bu Chukwu n'uwa ma n'igwe! Onye n'azu m bu Odogwu akataaka, Chineke igwe ndi agha Onye n'azu m bu Chukwu nk'igwe ndi agha. Messiah bu onye n'azu m, kwa mgbe, kwa mgbe; Messiah bu onye n'azu m hoohaa! Okaaka Messiah bu onye n'azu m kwa mgbe Odighi ihe koro m Messiah bu onye n'azu m hoohaa! Onye keruwa Kpara Chineke bu onye n'azu m, hoo! haa! Onye keruwa Nuru anu ru ndu bu onye n'azu m, hoo! haa! Onye keruwa Odum ebo Juda, b'onye n'azu m. hoo! haa! Onye keruwa VERSE 1 Chineke na azu m ka aturu n'eziokwu O dighi ihe koro m, N'ebe ahihia ndu di ka O n'eme ka m makpuru. n'eziokwu O dighi ihe koro m, n'akuku mmiri ndu ka O n'enye m ikezuike n'eziokwu O dighi ihe koro m, O n'enye ndu na mkpur'obi m, O n'enye ndu na mkpur'obi m. VERSE 2 O n'edu m n'uzo kwuru oto, O n'edu m, O n'edu m dika Aha Ya si di O n'edu m, O n'edu m, O buru na m gaga n'ochichiri O n'edu m, O n'edu m, Egwu agaghi atu m O n'edu m, O n'edu m, I ji mkpala Gi nonyere m mgbe ahu O n'edu m, O n'edu m, Ya k'I ji enye m agbaume, O n'edu m, O n'edu m. VERSE 3 I kwadooro m oriri n'iru ndiro m, I kwadooro m oriri n'iru ndiro m O Jesu, Ude di mma ka I weere wee tee m n'isi iko m ejula n'onu.

Download the sheet music

ONYE N'AZU M BU CHUKWU

ONYE N'AZU M BU CHUKWU

By Gerald C. Ani
Solfa
Igbo
5 pages
8 Downloads
Communion Hymns Burial / Funeral Hymns Hymns Responsorial Psalms
0 0

More lyrics you may want