Full Lyrics
INTRO
Ọr' obodo pụtanụn'oge erugo (Ahe)
Pụtawa nụ ngwa ngwa n'ih'ukwu n'eme (Ahe)
Maka na eme ngwa ngwa emegharia ọdachi (Ahe)
Onwer'omenala pụrụ iche anyi n'eme (Ahe)
Onye nwere okwukwe na nchekwube bịa (Ahe)
Bianụ k'anyi jee nu nara nụ ya
KORỌS
Oriri nsọ bụ omenala pụrụ iche
Oriri dị asọ bụ omenala di nsọ
Ezi okwukw'anyi nwere na Chukwu
na nchekwub'anyi na ndụ ụwa gaabịanụ
K'anyi n'egosi pụta n'oriri dị asọ
omenala dị nsọ
AMAOKWU NKE MBỤ
Anyị kwere na Chukwu nwa wer'ahụ
Wee dozie agbata chukwu na mmadụ o
nyer'anyi onwe ya n'udị achịcha na mmanya
ndị nwer'okwukwe pụta nụ nara nụ ya
AMAOKWU NKE ABỤỌ
N'oriri dị asọ eluigwe n'ụwa n'emekorịta
Maka olileanya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ
Nchekwub'anyi na ndụ ụwa gaabịanụ
mere anyi jie je n'altar anata Kristi
AMAOKWU NKE ATỌ
Omenala abụghịkwa arụrụala
K'anyi wepu aka n'ojọ
k'anyi jidesie ike ihe di mma n'omenal'a anyi
k'anyi wee tosi etosi ịnata Kristi
AMAOKWU NKE ANỌ
Kunite nara nụ Nriọma nrị si n'igwe
N'oriri dị asọ anyi n'erikọ anụkọ
n'ofuiko dika umunne si eme
n'omenal'anyị ịnata oriri dị asọ
bukwa omenala nke ya omenala di nsọ
onye g'anata Kristi g'enwe okwukwe
onyinyem muo Chukwu ji emeọgọ
okwukwe n'eme anyi k'anyi kwere
n'achịcha anyi n'anata bụ ahụ Kristi n'ezie
Onye g'anata Kristi g'enwenchekwube
maka n'oriri dị asọ bụ nri ndi ije
ọ naenye olileanya na agbamume
na njem nke okwukwe anyi naeje
enwe kwala nkoropuo kwe gi adala
ru'og' ikpeazu ịhụ Chineke ihu na ihu
Kunite nwannem naranụ ya doo