Full Lyrics
[INTRO]
Ogen' Ekeresimesi a kụbago
Kọkọkam kọm Ogen' Ekeresimesi a kụbago
Kọkọkam kọm Ogene n'ada na Betlehem
Kọkọkam kọm
Makana a mụrụ Onye nwe anyị
O nyenzọpụta bịago
Maka na a mụrụ Onye nwe anyị
O nyenzọpụta bịago
[REFRAIN]
Anyị e je w'e nete nw'a mụrụ na Betlehem
Anyị e je w'e nete nw'a mụrụ na Betlehem
K'anyị ṅụrị ba n'ony'e zọpụta bịago n'ụwa Iyooh
Anyị e je w'e nete nw'a mụrụ na Betlehem
Anyị e je w'e nete nw'a mụrụ na Betlehem
Ebe O bịa lu Ụwa ni le g'enwe nzọpụta I yooh
Anyị e je w'e nete nw'a mụrụ na Betlehem
Ony'Eze nke ndị amụma kwuru n'ọ g'a bịa I yooh
Anyị e je w'e nete nw'a mụrụ na Betlehem
Ekene dịrị Chukwu Onye nyer'anyị nwa ya I yooh
Anyị e je w'e nete nw'a mụrụ na Betlehem
Ị makwa nke n'e me?
O ny'Eze a bịago
O ny'Eze a bịago
Jisos nwa Chukwu Ọ g'atọ anyị n'a gbụ
A gbụ nke njọ Ọ g'agwọ anyị ọrịa
Ny'anyị Ngọzi ya
K'anyị sị ya
O ny'e bu be O nye ndu m o
Dike n'a gha
Nna dị e bi gh'e bi
Eze n'u do I yooh
Anyị e je w'e nete nw'a mụrụ na Betlehem
Ayaya O ho
Ayaya O ho
Ayaya O ho Onye nze bịago n'ụwa
Ayaya O ho
Ayaya O ho
Ayaya O ho Ụwa ni le g'enwe nzọpụta
Gbab'egwu Ogen' Ekeresimesi n'a kụ
I yooh Ooh I yeeh I yoo
Kọ kọ kọ kọ Ooh I ya I ya I ya I yee I yooh
Anyị e je w'e nete nw'a mụrụ na Betlehem
O hoo
[VERSE 1]
Ị chere n'ọ dị mfe?
Ị chere n'ọ dị mfechaa?
Mmadụ ị tụfu ndụ ya maka O ny'o fulu n'anya
Ị sị n'ọ dị mfe gaa nụ nwụọ nụ maka ndị enyi gị
Jesu mọọ Ihe I mere dịkwa ịtụnanya
Ya k'anyị ji bulu kpa ekene ne bunye gị
Nna mbọ Ntọ Nnọ Ị sa Ishii Ị saa I yooh
[VERSE 2]
Anyị nọ na Betlehem
Nke dị n'obodo Judea
Anyị bịara neta nw'ọhụrụ
Nwa g'achị Ụwa nile
Ndị eze atọ sokwa bịa neta ya
Ha nyere y'Onyinye ndị eze atọ
Gold Frankinscence na Myrrh
Onyinye ndị a pụrụ iche
Anyị n'a sị O ny'Eze nnọọ
Nnọọ n'obi anyị n'ọfụọfụ