CHUKWU DALU! by Emma Orji — Lyrics

Emma Orji Igbo Offertory Hymns Hymns Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ihe ọma Chim meere m n'elu ụwa dị n'ezi mma Ihe ọma O meere m n'elu ụwa asọgbue m o Ndụ O nyere m o, ahụ ike O nyere m o Ọdụdụ ọma ya na nchekwa ya dị n'ezi mma Bịa nụ soro m o ka m bunye Chim ekele Bịa nụ soro m o ka m bunye Chim otito Bute egwu mara mma k'anyị jee o! Bute nụ ihe onyinye dị mma k'anyị jee o! K'anyị jee jee kele ya K'anyị jee sị ya I meela K'anyị jee kele Chineke K'anyị jee sị ya daalụ VERSE 1 Mgbe m biliri n'ụra ụtụtụ ọ naeju m obi Maka ngọzi Chineke n'ime ndụ m o Ụfọdụ lakpuru n'abalị mana ha eteteghị Ekele dịrị Chineke ebe m lakpuru teta VERSE 2 Ụfọdụ nọ n'ụlọ ọgwụ n'asụ ude Ụfọdụ ejenwughị ụlọ ọgwụ mana ha naebe Mana m pụtara were ụkwụ m a gaghari Ekele dịrị Chineke onye nyere m ahụ ike VERSE 3 Ụfọdụ bụ ndị gara njem mana ha alataghị Ụfọdụ bụkwazị ndị lọtara n'ahụ ọnwụ nwu Mana m n'eje eje abata m a ọkọ akọghị m Ekele dịrị Chineke onye duuru m jee lọta VERSE 4 Ụfọdụ bụkwa ndị e gburu n'ọgbaghara obodo Ụfọdụ bụkwazị ndị mmiri naetigbu zọgbuo Mana m nọ ya ọ dịghị ihe mere m o Ekele dịrị Chineke onye duubere m chebe m o VERSE 5 Soro nụ m kele nụ ya Omeokachie! Sọ ya bụ dike ndị kere re ọkaka Sọ ya bụ ọdọgwu Nnam o Eze m o onye ukwu Sọ ya bụ Chim obi m o Chim ọma Aga m enye ya ekele Ekele, ekele Aga m enye ya otito Chukwu daalụ

Download the sheet music

CHUKWU DALU!

CHUKWU DALU!

By Emma Orji
Solfa
Igbo
4 pages
5 Downloads
Offertory Hymns Hymns Celebrations
0 0

More lyrics you may want