Full Lyrics
REFRAIN
Ihe ọma Chim meere m n'elu ụwa dị n'ezi mma
Ihe ọma O meere m n'elu ụwa asọgbue m o
Ndụ O nyere m o, ahụ ike O nyere m o
Ọdụdụ ọma ya na nchekwa ya dị n'ezi mma
Bịa nụ soro m o ka m bunye Chim ekele
Bịa nụ soro m o ka m bunye Chim otito
Bute egwu mara mma k'anyị jee o!
Bute nụ ihe onyinye dị mma k'anyị jee o!
K'anyị jee jee kele ya
K'anyị jee sị ya I meela
K'anyị jee kele Chineke
K'anyị jee sị ya daalụ
VERSE 1
Mgbe m biliri n'ụra ụtụtụ ọ naeju m obi
Maka ngọzi Chineke n'ime ndụ m o
Ụfọdụ lakpuru n'abalị mana ha eteteghị
Ekele dịrị Chineke ebe m lakpuru teta
VERSE 2
Ụfọdụ nọ n'ụlọ ọgwụ n'asụ ude
Ụfọdụ ejenwughị ụlọ ọgwụ mana ha naebe
Mana m pụtara were ụkwụ m a gaghari
Ekele dịrị Chineke onye nyere m ahụ ike
VERSE 3
Ụfọdụ bụ ndị gara njem mana ha alataghị
Ụfọdụ bụkwazị ndị lọtara n'ahụ ọnwụ nwu
Mana m n'eje eje abata m a ọkọ akọghị m
Ekele dịrị Chineke onye duuru m jee lọta
VERSE 4
Ụfọdụ bụkwa ndị e gburu n'ọgbaghara obodo
Ụfọdụ bụkwazị ndị mmiri naetigbu zọgbuo
Mana m nọ ya ọ dịghị ihe mere m o
Ekele dịrị Chineke onye duubere m chebe m o
VERSE 5
Soro nụ m kele nụ ya
Omeokachie!
Sọ ya bụ dike ndị kere re ọkaka
Sọ ya bụ ọdọgwu Nnam o
Eze m o onye ukwu
Sọ ya bụ Chim obi m o
Chim ọma
Aga m enye ya ekele
Ekele, ekele
Aga m enye ya otito
Chukwu daalụ