CHIM NONSO by Nwankwo Cosmas C — Lyrics

Nwankwo Cosmas C Igbo Offertory Hymns Hymns Celebrations Concert Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Chim nonso, Chimu nọ munso Oge niile ihe m rịọrọ ya K'o mere mo, anya mmiri abalị mo Chineke hichago mu ya K'anyi jee nye ekele, ụmụibe oh ṅụrịbanụ Bịa soro m kele Chukwu, kele nu ya n'ezie Chimu nọ munso, ngwanụ bịanụ kele Bịanụ kele, bịa kele Chineke Nke chijindụ mo, Onye ker'ụwa dalụ Chukwu n'edu mo n'ezie Chimu nọ munso, mo ị bụ odogwu [VERSE 1] Chukw'okike abiago m i kele gị Mak'ọgọ n'afọma gị Nara onyinye nji bịa, goziri kele ya But'onyinye gị ụmụnne m K'anyi jee k'anyi jaa ya mma Kele Chukwu, k'anyi jee nu Kele Chukwu, k'anyi jee nu Kele Chukwu nye Chineke onyinye Kele Chukwu fwo, kele Chukwu n'ọ bụ nwanne m Kele Chukwu n'ezie ọ bụ odogwu Bịa kele ya [VERSE 2] Ekele dike na nka, o mere omekwo Onye chineke, ezi chineke K'anyi jee nu kele Chukwu K'anyi jee nu kele Chukwu K'anyi jee nu kele Chukwu nye Chineke onyinye Kele Chukwu fwo, kele Chukwu n'ọ bụ nwanne m Kele Chukwu n'ezie ọ bụ odogwu [VERSE 3] Ekel'ọma kam ji bịa Chineke mo Nare kele mo, abụ otito kam ji Bịa Chukwu nna mo, rib'otito mo Ọ bụ onye kam ga kọrọ ihe Chukwu n'emere mo Ih'o mere n'ime ndụ mo n'em'obi ọma Obi sọlị sọlị, mgb'ọgbayara dom mo Chineke hicharam anya mmiri Ebe ube mekwala ko si eme Chineke mo rib'otito mo dalụ Onyinye efele na abụ otito kam ji Bịa n'iru gị i kele gị Rib'otito mo

Download the sheet music

CHIM NONSO

CHIM NONSO

By Nwankwo Cosmas C
Solfa
Igbo
3 pages
8 Downloads
Offertory Hymns Hymns Celebrations Concert
0 0

More lyrics you may want