Full Lyrics
[CHORUS]
Haleluia Chim, lee! Ọnụ m juru n'ekele
Mak'ihi n'eme kam ji bịa kam tuoro gị nma mma.
Nma mma. I bu Chukw'omiko Chukw'obi ọma
Chi nyere mụ ndụ n'ahụ isike Chi n'edum ije
Chi n'agwọm ọrịa n'anaghịm ego nma mma dịrị gị
Ọnụ m juru n'ekele mak'ihi n'emere mo.
[REFRAIN 1]
Ngwa nụ ụmụnne m k'anyi jee kele Chukw'ọma
Ngwa nụ ụmụnne m k'anyi nye y'onyinye dị nma
Unu ndị Chukwu gọziri agọzi bịa nye y'ekele
Bịa nye y'otito na Chi anyị n'efe bụ Chi ọma.
[REFRAIN 2]
Chim lee Chukw'ọma Chim lee
Chim! Chim!! I dịrịm nma oh
Ọ bụ ya kam ji n'ekele s'imela
Ọnụ ọchị kam ji ekwere g'ukw'otito
Ọkaka egwu ọma kam ji bur'onyinye bata
Iya kam g'eji egwu egwu kam g'eji
Inyeg'ekele ọdịghị Chi dịka gị eh Chiobi ọma mo
Chi mere mụ nma a sịm gị
Nar'onyinyem jiri bịa n'ihu ọma.
[VERSE 1]
I n'ementamụ ihu ụwa ọn'esiri g'ike ọ n'adị gị
Ka Chi anyị n'efe chefugo gị eh! nwanne m
Bilie n'ụkwụ gị gbaw'egwu kele Chukwu Chi nyere gị ndụ taa
Ọ g'agọzikwa g'echi ekel'ony'akịdị
Ọgwọw'ọz'Ọtinye ya mkpụrụsụ kelee Chin'eke
Nandụịdị nke Chi tụrụ kanma bilie ọtọ gbaw'egwu
Kele Chin'eke n'ih'omer'erika bịa nye y'onyinye
Na Chi anyị n'efe bụ Chi ọma.
[VERSE 2 OSTINATO]
Jide nk'iji ma agbawakwalam aka
Jide nk'iji ma agbawakwalam aka,
Ewepụga Gị Chi mo nkem n'eme n'ụw'agwụla
Ewepụga Gị Chi mo gịnị kam gar'eme?
Ọ bụ onye gar'enyem ndụ?
Ọ bụ onye g'echekwa mo?
Ọ bụ onye gar'enyem akụ?
Ọ bụ onye gar'enye mụ nwa
Ọgwọm ọrịa n'anaghịm ego
Ọdụputam ọkwọr'azụ a sịm gị
Jide nk'iji ma a gbawakwalam aka.