CHIM, NMA MMA by Augustine J.C. Chinam — Lyrics

Augustine J.C. Chinam Igbo Offertory Hymns Hymns Folk songs Celebrations Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Haleluia Chim, lee! Ọnụ m juru n'ekele Mak'ihi n'eme kam ji bịa kam tuoro gị nma mma. Nma mma. I bu Chukw'omiko Chukw'obi ọma Chi nyere mụ ndụ n'ahụ isike Chi n'edum ije Chi n'agwọm ọrịa n'anaghịm ego nma mma dịrị gị Ọnụ m juru n'ekele mak'ihi n'emere mo. [REFRAIN 1] Ngwa nụ ụmụnne m k'anyi jee kele Chukw'ọma Ngwa nụ ụmụnne m k'anyi nye y'onyinye dị nma Unu ndị Chukwu gọziri agọzi bịa nye y'ekele Bịa nye y'otito na Chi anyị n'efe bụ Chi ọma. [REFRAIN 2] Chim lee Chukw'ọma Chim lee Chim! Chim!! I dịrịm nma oh Ọ bụ ya kam ji n'ekele s'imela Ọnụ ọchị kam ji ekwere g'ukw'otito Ọkaka egwu ọma kam ji bur'onyinye bata Iya kam g'eji egwu egwu kam g'eji Inyeg'ekele ọdịghị Chi dịka gị eh Chiobi ọma mo Chi mere mụ nma a sịm gị Nar'onyinyem jiri bịa n'ihu ọma. [VERSE 1] I n'ementamụ ihu ụwa ọn'esiri g'ike ọ n'adị gị Ka Chi anyị n'efe chefugo gị eh! nwanne m Bilie n'ụkwụ gị gbaw'egwu kele Chukwu Chi nyere gị ndụ taa Ọ g'agọzikwa g'echi ekel'ony'akịdị Ọgwọw'ọz'Ọtinye ya mkpụrụsụ kelee Chin'eke Nandụịdị nke Chi tụrụ kanma bilie ọtọ gbaw'egwu Kele Chin'eke n'ih'omer'erika bịa nye y'onyinye Na Chi anyị n'efe bụ Chi ọma. [VERSE 2 OSTINATO] Jide nk'iji ma agbawakwalam aka Jide nk'iji ma agbawakwalam aka, Ewepụga Gị Chi mo nkem n'eme n'ụw'agwụla Ewepụga Gị Chi mo gịnị kam gar'eme? Ọ bụ onye gar'enyem ndụ? Ọ bụ onye g'echekwa mo? Ọ bụ onye gar'enyem akụ? Ọ bụ onye gar'enye mụ nwa Ọgwọm ọrịa n'anaghịm ego Ọdụputam ọkwọr'azụ a sịm gị Jide nk'iji ma a gbawakwalam aka.

Download the sheet music

CHIM, NMA MMA

CHIM, NMA MMA

By Augustine J.C. Chinam
Staff & Solfa
Igbo
15 pages
2 Downloads
Offertory Hymns Hymns Folk songs Celebrations
0 0

More lyrics you may want