Full Lyrics
INTRO
Odidi, odidi, odidi, odidi.
VERSE 1
O Chukwu, anyi naario gi
Nyenu anyi ike eji edi
Obi naagbawa anyi
Nyenu anyi ike eji edi
Alili egbukwaa anyi
Nyenu anyi ike eji edi
Anyi ma na onwu bu uzo ndu
Mana ufu onwu fialu aru idi
Mgbawaobi onwu fialu aru idi
Chukwu nwa ya nwuru n'obe
Ya kayi ji ario gi Nna
Nyenu anyi ike eji edi
Ike e ji ekwu
CHORUS
Naa n'udo, o di n'obi mo
Ebe I no ka mma, ezigbo enyi mo
Naa gboo, naa gboo
Chukwu akpogo gi
Naa gboo, naa gboo
Jee nke oma
Naa n'udo, o di n'obi mo
Ebe I no ka mma, ezigbo enyi mo
Naa gboo, naa gboo
Chukwu akpogo gi
Naa gboo, naa gboo
Jee nke oma
Naa gboo
Naa gboo
VERSE 2
O Chukwu, anyi bu mmadu
Nyenu anyi ike eji edi
Nkea meturu anyi
Nyenu anyi ike eji edi
O ka naadi ka nro
Nyenu anyi ike eji
Anyi ma na onwu bu uzo ndu
Mana ufu onwu fialu aru idi
Mgbawaobi onwu fialu aru idi
Chukwu nwa ya nwuru n'obe
Ya kayi ji ario gi Nna
Nyenu anyi ike eji edi
Ike e ji ekwu
VERSE 3
Ezigbo enyi mo
Anyi amanchezo gi
O nwannem
Anyi huru gi n'anya
Onye nke mo
Anyi gaesiri gi ike
Odinobi mo
Anyi gaeficha anya
Maka ufu onwu bu maka ndi di ndu
Mgbawaobi onwu bu maka ndi di ndu
Ihe anyi g'emere onye nwuru anwu
Bukwa icheta ndu ya
Tiye aka n'obi
Nweta ike eji ekwu!