Full Lyrics
INTRO
Obinigwe bia anyị a bịala anyị a bịala
Anyị a bịala anyị a bịala anyị a bịaruola
REFRAIN
Ony'ọma mụ nara biko Nna doo
Chukwuọma nara biko Nna doo
VERSE ONE
Isi iyi nke ndụ Onyeker'ụwa Chukwuọma m e
Ony'ọma naranụ aja ụmụ Gị n'achụrụ Gị e
Anyị n'ebuteere Gị achịcha, achịcha na mmanya nke I nyer'anyị e
Chukwuọma naranụ naranụ ya n'aka ụkọchukwu Gị e
VERSE TWO
Agbanweagbanwe onye nwem Gị bụ Eze
Ọmalịcha Chukwuọma biko naranụ onyinye anyị e
N'aka ụkọchukwu Gị wubere Chukwu e Chukwu e Chukwu o
Chukwuọma naranụ naranụ ya n'aka ụkọchukwu Gị e
VERSE THREE
Apatanekwu nwa n'afọ onye nwere Gị nwer'ihe dị mma e
Nara aja ụmụ Gị n'achụrụ Gị e
Onyinye nk'I nyer'anyị onyinye mara mma ọ dị n'aka Gị e
Chukwuọma naranụ naranụ ya n'aka ụkọchukwu Gị e