O NWERE IHUNANYA DI KA NKEA — Lyrics

Igbo Communion Hymns Hymns Prayer Eucharistic songs Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 O nwer' ịhụnanya dị ka nkea Na Chukwu bịara n'ụwa We bụrụ ihe oriri nke madụ Ndi nọ n'ụzọ nk'eligwe. VERSE 2 A ga m eje nata ahụ Jesu Bu mbe nke ndụ ebebe. Ọ n'enye ahụ madụ ike Nk'iji bilite n'ọnwụ. VERSE 3 Jesu, mee ka ahụ n'ọbara Gị Ghụchapu mmehie m nile, Mee ka ha doo mkpur' obi m asọ Belata agụụ nk'ime njọ. VERSE 4 Biko, Jesu, nye m obi nke Gị Ka m we hụ Chukwu n'anya, Ka m hụ madụ ibe m nile n'anya Sọsọ mak'ihi Chukwu. VERSE 5 K' olili nsọ jikọọ mụ na Gị Na ndi otu nke Nzukọ. Oge agha nke ụwa gwụsịrị, K'anyị zukọ n'eligwe.

Download the sheet music

O NWERE IHUNANYA DI KA NKEA

O NWERE IHUNANYA DI KA NKEA

Solfa
Igbo
1 page
8 Downloads
Communion Hymns Hymns Prayer Eucharistic songs
0 0

More lyrics you may want