Full Lyrics
REFRAIN
Chineke, O ji ọkụ eri aja,
Nara aja anyị nachunyere gị,
Site n'aka ụkọchukwu gị.
VERSE 1
Onye ozi gị Elaija chunyere gị aja,
Gbadatara n'ụdị ọkụ nara aja a wee rie.
VERSE 2
Nwaodibo gị Abel chunyere gị aja,
Gbadatara n'ụdị ọkụ nara aja a wee rie.
VERSE 3
Anyị nachuru gị aja site n'ihe i nyere anyị,
Chukwu onye dị mma, nara ya ma gozie anyị.