Full Lyrics
VERSE 1
Nwaanyị bịara ụka nwa naenwe añụrị
Oku nwa ya n'aka dịka Marịa
Nwaanyị bịara ụka nwa naenwe añụrị
Oh Chukwu gọzie ya, gọziekwa nwa ya
CHORUS
Oh Chukwu gọzie ya, nara ekpere ya
Amara Chineke wụchaa obi ya
Nwaanyị mụtara nwa naenwe añụrị
Oh Chukwu gọzie ya, gọziekwa nwa ya
VERSE 2
Lee ya ka ọ naabata n'ụlọ nsọ Chukwu
O ji ọkụ ya n'aka bịa inye ekele
Nwaanyị mụtara nwa naenwe añụrị
Oh Chukwu gọzie ya, gọziekwa nwa ya
VERSE 3
Ụfụ n'afụ nwaanyị mgbe ọ naamụ nwa
Ma ụfụ ya naakwụsị mgbe ọ mụsịrị ya
Nwaanyị mụtara nwa n'enwe añụrị
Oh Chukwu gọzie ya, gọziekwa nwa ya