Full Lyrics
[Chorus]
Ọ bụ onye n'e mee Eze?
Ọ bụ onye n'echi Eze?
Ya bu na onye bu Eze m'ọbu nwa bu Eze ah
Ọ bu Chukwu mere ya.
Iye, iye, onye m'ọbu nwa bu Eze
Ọ bu Chukwu mere ya
Ebe Chi mere m'Eze
Ewo! aga m'enye ya ekene.
[Verse 1]
Soro m kene nu Chukwu Okike,
O mena m'Eze,
O si na ebe an'ekpọ afịfịa wee bunie m'enu
Aga m'enye Ya ekene.
I ma n'ọ buniri m enu
I ma n'ọ goziri m n'ezie.
Gịni kam g'e ji kene Ya
Maka n'ọ mena m Eze.
[Verse 2]
Onye kam bu na Chineke mere m'Eze?
Omere onwe ya ogbenye burụ ogaranya
Aga m'enye ya ekene o.
Maka na Chukwu bunirim
Mbobo!
A ga m'ekene Chiahu mere num Eze,
A ga m'ekene Chiahu tube te m ugo
Daalu o Jọọkwa o arịnze gi o
Imeela.
[Finale]
Ye iye Nwa bu Eze
Ọ bu Chukwu mere ya
Ebe Chi mere m'Eze
Ewo aga m'ekene Ya do.
[Alto Solo]
Maka na onye Chi mere Eze
Ah ha Eya
Onye Chi tubelugo
Onye k'o ga bu
Onye Chi telummanu
Onye k'o ga bu
Onye Chi bunir'e
De wo k'o ga bu
Onye gaekwu to ya
Chi gozi go mo n'enu uwa ah
Onye Chi goziri do
Onye gaekwu to ya?
Nwabueze
Ta, ta, ta, ta
Chi a go zi go
M, m, m, m,
Chi goziri.