NWABUEZE =Uplifted= by Emma Urom Eze — Lyrics

Emma Urom Eze Igbo Offertory Hymns Celebrations Hymns Ordination Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[Chorus] Ọ bụ onye n'e mee Eze? Ọ bụ onye n'echi Eze? Ya bu na onye bu Eze m'ọbu nwa bu Eze ah Ọ bu Chukwu mere ya. Iye, iye, onye m'ọbu nwa bu Eze Ọ bu Chukwu mere ya Ebe Chi mere m'Eze Ewo! aga m'enye ya ekene. [Verse 1] Soro m kene nu Chukwu Okike, O mena m'Eze, O si na ebe an'ekpọ afịfịa wee bunie m'enu Aga m'enye Ya ekene. I ma n'ọ buniri m enu I ma n'ọ goziri m n'ezie. Gịni kam g'e ji kene Ya Maka n'ọ mena m Eze. [Verse 2] Onye kam bu na Chineke mere m'Eze? Omere onwe ya ogbenye burụ ogaranya Aga m'enye ya ekene o. Maka na Chukwu bunirim Mbobo! A ga m'ekene Chiahu mere num Eze, A ga m'ekene Chiahu tube te m ugo Daalu o Jọọkwa o arịnze gi o Imeela. [Finale] Ye iye Nwa bu Eze Ọ bu Chukwu mere ya Ebe Chi mere m'Eze Ewo aga m'ekene Ya do. [Alto Solo] Maka na onye Chi mere Eze Ah ha Eya Onye Chi tubelugo Onye k'o ga bu Onye Chi telummanu Onye k'o ga bu Onye Chi bunir'e De wo k'o ga bu Onye gaekwu to ya Chi gozi go mo n'enu uwa ah Onye Chi goziri do Onye gaekwu to ya? Nwabueze Ta, ta, ta, ta Chi a go zi go M, m, m, m, Chi goziri.

Download the sheet music

NWABUEZE =Uplifted=

NWABUEZE =Uplifted=

By Emma Urom Eze
Solfa
Igbo
5 pages
0 Downloads
Offertory Hymns Celebrations Hymns Ordination Hymns
1 0

More lyrics you may want