N'oriri Ikpeazụ (Tune II) by Very Rev. Fr. C. Ezenduka — Lyrics

Very Rev. Fr. C. Ezenduka Igbo Communion Hymns Holy Week Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 N'oriri Ikpeazụ Jesu rịọrọ Nna ya ka nzukọ Ya bur'otu n'eluwa anyi n'arịọ Gi N'oriri nke tata k'anyi nile soro n'irịọ Chukwu K'anyi ncha bur'otu ahụ n'ime Sacrament di asọ. VERSE 2 Maka nzukọ k'anyi nile n'arịọ Gi ka ndi otu Christi ju rii hunanya ka obi mmadu N'uwa nine bur'otu kpọkọba mmadu ncha n'akụkụ Gi K'anyi ncha bur'otu ahụ n'ime Sacrament di asọ. VERSE 3 Anyi n'arịọ maka ndi otu Christi k'e kpochighaa ha N'otu igwe aturu ka ha wee nọrọ N'okpuru otu onyeisi na nzukọ nke jikọrọ mmadu ncha K'anyi ncha bur'otu ahụ n'ime Sacrament di asọ. VERSE 4 Oge geru mgbe Sacrament gagwụ O Jesu Kpọba anyi n'eluigwe k'anyi soro ndi Mụọma Na ndi nile di nsọ hu Gi anya n'añụrị na ndokwa K'anyi binyere ebebe ito n'ime otu di ngọzi.

Download the sheet music

N'oriri Ikpeazụ (Tune II)

N'oriri Ikpeazụ (Tune II)

By Very Rev. Fr. C. Ezend...
Solfa
Igbo
2 pages
0 Downloads
Communion Hymns Holy Week Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want