Full Lyrics
REFRAIN
N'oriri ikpeazu Jesu rioro Nna Ya
ka Nzuko Ya bur'otu n'elu uwa
Anyi n'ario Gi n'oriri nke taa
K'anyi nile soro n'irio Chukwu
K'anyi ncha bur'otu ahu n'ime Sacramenti di aso.
VERSE 1
Maka nzuko k'anyi nile n'ario Gi,
Ka ndi otu Kristi ju n'ihunanya:
Ka obi mmadu no n'uwa buru otu.
Kpokoba mmadu ncha n'akuku Gi;
K'anyi ncha buru otu ahu n'ime Sacramenti di aso.
VERSE 2
Anyi n'ario maka ndi otu Kristi;
K'I kpochigha n'otu igwe aturu.
Ka ha wee noro n'okpuru otu onye isi,
Na nzuko nke jikoro mmadu ncha.
K'anyi ncha buru otu ahu n'ime Sacramenti di aso.
VERSE 3
Oge g'eru mgbe Sacramenti g'agwu; O Jesu kpobata anyi n'eligwe,
K'anyi soro ndi mmuoma na ndi niile di nso, hu Gi anya n'anuri na ndokwa.
K'anyi binyere ebebe Ato n'ime otu di ngozi.