Full Lyrics
VERSE 1
N'oriri ikpeazu Jesu rioro Nna Ya
k'Anzuko Ya bur' otu n'elu uwa
Anyi n'ario Gi n'oriri nke ta ta
k'anyi nile soro n'irio Chukwu
k'anyincha bur' otu ahu n'Ime Sacrament di aso.
VERSE 2
Maka nzuko k'anyi nile n'ario Gi
k'andi otu Kristi ju n'ihunanya.
Ka obi mmadu n'uwa nile buru otu
kpokoba mmaduncha n'akuku Gi
k'anyincha bur' otu ahu n'Ime Sacrament di aso.
VERSE 3
Anyi n'ario maka ndi Otu Kristi
k'I kpochigha ha n'otu igwe aturu.
Ka ha wee noro n'okpuru otu onyeisi
Na nzuko nke jikoro mmaduncha
k'anyincha bur' otu ahu n'Ime Sacrament di aso.
VERSE 4
Mgbe g'eru mgbe Sacrament g'agwu
O Jesu kpobata anyi n'eligwe.
K'anyi soro ndi muo oma na ndi nile d'inso
Ilu Gi n'anya n'anuri na ndokwa
k'anyi binyere ebebe Ito n'Ime ofu di ngoso.