Full Lyrics
REFRAIN
N'oriri ikpeazu Jesu riọrọ Nna Ya
ka Nzukọ Ya bur'otu n'elu ụwa
n'ariọ Gị n'Oriri nke taata
k'anyi nile soro n'iriọ Chukwu
bur'otu ahụ n'ime Sakramenti dị asọ.
VERSE 1
Maka nzukọ k'anyi nile n'ariọ Gị
ka ndi otu Kristi ju n'ihu n'anya.
bi mmadụ n'ụwa nile buru otu
kpọkọba mmadụ ncha n'akụkụ Gị
bur'otu ahụ n'ime Sakramenti dị asọ.
VERSE 2
Anyi n'ariọ maka ndi Otu Kristi
k'I kpọchigha ha n'otu igwe atụrụ.
wee nọrọ n'okpuru otu onye isi
na nzukọ nke jikọrọ mmadụ ncha
bur'otu ahụ n'ime Sakramenti dị asọ.
VERSE 3
Oge g'eru mgbe Sakrament g'agwụ
O Jesu kpọbata anyi n'eligwe.
soro ndi mụọ ọma na ndi nile dị nsọ
hụ Gị n'anya n'anụrị na ndokwa
nyere ebebe itọ n'ime ofu dị ngọsọ.