Full Lyrics
Njinji jiri na Galilee, nwanne m na Kristi anyi ekuligo.
Onwu, onwu, onwu, onwu, onwu o.
Nto, Jesu emerigo.
Ka uwa nile nwebe aṅụrị.
N'obe Calvary ka akpọgburu Jesu.
Lee Jesu emerigo, ọ biligo.
Gosia Eze uwa nile,
nyenụ mbilite n'ọnwụ di Jesu mụọ.
Otito dịrị gị.
Bịa bịa k'anyị gaanụ na Galilee.
Ebenebe egbugo, njinji ejigo.
Uwa nile kpọtụba, kpọtụba mebe aṅụrị makana Jesu emerigo ọnwụ.
Uwa nile mebe aṅụrị.
[Treble Solo]
Butenụ ekwe, butenụ ogwe, butenụ ọdụ,
butenụ ube na mkpọtọm kpọ na ọyọ.
[Chorus]
Bukuonụ ya abụ ọma, bukuonụ ya abụ ọma,
bukuonụ ya abụ ọma, bukuonụ ya abụ, abụ ọma,
bukuonụ ya abụ ọma, tibenụ mkpu aṅụrị, abụ ọma.
Bukuonụ ya abụ ọma, aṅụrị, bukuonụ ya,
ụmụ ụwa nwebe aṅụrị, kwebenụ Alleluia.
Bukuonụ ya abụ ọma, bukuonụ ya.
Oh Alleluia, Jesu emerigo, Kristi ekuligo, bịanụ o, bịanụ o.
Bukuonụ ya abụ ọma, bukuonụ ya abụ ọma.
Uwa ṅụrịba na Kristi ekuligo.
Bukuonụ ya na Kristi ekuligo.