Full Lyrics
CHORUS
Otito dịrị Chineke n'elu kacha elu.
REFRAIN
Udo dịrị ndị mmadụ n'ụwa ndị nwere obi ọma.
VERSE 1
Anyị ajaa gị mma, anyị agọzie gị.
Anyị esekpuro gị, anyị etoo gị.
Anyị ekele gị n'ihi nnukwu ebube gị.
VERSE 2
Osebuwa Chukwu, Eze nke eluigwe.
Chukwu Nna Onye ji ike niile.
Dinwenu Jesu Kristi, Sọ otu Nwa Chineke mụrụ.
VERSE 3
Dinwenu Chukwu.
Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna.
Gị onye naekpopụ njọ n'ụwa, meere anyị ebere.
VERSE 4
Gị onye naekpopụ njọ n'ụwa, nara arịrịọ anyị.
Gị onye nọ n'aka nri Nna, meere anyị ebere.
N'ihi na sọ gị dị nsọ, sọ gị bụ Dinwenu.
VERSE 5
Sọ gị Jesu Kristi.
Kacha dị elu n'ime Muọ Nsọ.
N'ebube Chineke Nna.
AMEN
Amen, Amen, Amen, Amen.