Full Lyrics
REFRAIN
Otito diri Chineke, diri Chineke
N'elu kachasielu
N'uwa udo diri ndi mmadu
Ndi nwere obi oma.
VERSE 1
Anyi ajaa gi mma, anyi agozie gi
Anyi esekpuoro gi, anyi etoo gi
Anyi ekele gi n'ihi nnukwu ebube gi.
VERSE 2
Osepuluwa, Chukwu eze nke igwe
Chukwu Nna ji ike niile
Dinwenu anyi Jesu Kristi
Soso otu nwa Chineke muru.
VERSE 3
Dinwenu anyi Chukwu, nwaturu nke Chineke
Nwa nke Nna
Gi onye n'ekpochapu njo nke uwa
Meere anyi ebere.
VERSE 4
Gi onye n'ekpochapu njo nke uwa
Nara aririo anyi
Gi onye no n'aka nri Nna
Meere anyi ebere n'ihi na soso gi.
VERSE 5
So ngi bu Dinwenum, so gi oh Jesu Kristi
So ngi di nso kasielu
Gi na Muo Nso n'ebube Chukwu Nna
Amen, Amen.