Full Lyrics
PRIEST
E kwerem n'otu Chineke
CHOIR
Nna ji ike nile, Onye mere elu igwe na ala
Na ihe nile a puru ihu anya na ndi a pughi ihu anya.
Ya n'Otu onye nwe anyi Jesu Kristi,
Nwa Chineke muru soso Otu nwa,
Nna muru tupu uwa tuwa niile.
Chukwu si na Chukwu, Ihe si n'Ihe,
Ezi Chukwu si n'ezi Chineke,
A muru amu emeghi eme,
Ya na Nna bu otu, Ihe n'odidi ebighebi.
Ha jiri buru Chukwu Onye si na Ya mee ihe dum,
Onye maka anyi bu mmadu na maka nzoputa anyi,
Si n'elu igwe gbadata.
O we ra ahu na Vejin Maria
Site na Mmuo Nso, O buru mmadu.
A kpo gbuo ya n'obe n'ihi anyi,
N'oge Pontus Pailet,
O taa ahuhu nwuo, e lie ya.
O bilitere n'ubochi nke ato,
Ka Akwukwo nso si kwuo,
O rigo n'elu igwe noro n'aka nri Nna.
O ga abia ozo n'ebube ya,
I kpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpe,
Onye ochichi ya n'enweghi njedebe.
E kwerem na Mmuo Nso,
Dinwenu na Onye n'enye ndu,
Onye si na Nna na Nwa puta,
Onye a n'esekpuru nye ekele kodo ya na Nna na Nwa,
Onye si n'onu ndi amuma kwuo okwu.
E kwerem n'Nzukọ nke di otu di Nso
Buru Catholic buru kwa Apostolic.
E kwu pu tam otu mmiri Chukwu maka mgbaghara njo.
A nam atu anya mbilite n'onwu ndi nwuru anwu
Na ndu uwa g'abia.
Amen.