Full Lyrics
REFRAIN
Chukwu bi n'igwe, anyị abịawo n'iru Gị.
Ndị Gị bịara n'obi Gị, butere Gị onyinye.
Onyiny'ọma ka m ji bịa, onyiny'iny'ekele
Maka ngọzi Gị, amara Gị, ebere na obiọma Gị.
M chet'ịhụnanya Gị, obi n'emerube mo!
Ndụ dịrị mo, a ga m aja Gị nma.
Ndụ dịrị mo, a ga m ebuli Gị elu.
Ndụ dịrị mo, a ga m ekele Gị, Chukwuọma.
VERSE 1
Enwere m nchekwube n'aga m'ahụ afọ ma Chineke n'ala ndị dị ndụ.
Chi nwe ndụ mo, nar'onyinye mo gọzie ya, nar'otito mo gọzie. Nara ya gọzie!
Ih'I mer'asọgbue mo, Dinwenum na Chukwu mo!
Ndụ dịrị mo, a ga m'ekele Gị, ezi Chukwu.
K'anyị tuoro Ya nmanma.
VERSE 2
Ndị dị ndụ g'ebutere Gị, Nna, onyinye mara nma, onyinye bur'ibu.
Ih'I n'emere mo, ọnụ m'apụgh'ịkọchasị.
Ndụ dịrị mo, a ga m'asọpụrụ Gị.
Ndụ dịrị mo, a ga m'ekele Gị, ezi Chukwu.
K'anyị tuoro Ya nmanma.
VERSE 3
Ndụ dịrị mo, a ga m'esekpuru Gị, a ga m'efe Gị ofufe, doo Aha Gị ebube,
Kwupụta ọrụọma Gị, ezi Chi m'ọma, gọzie Aha Gị, tuoro Gị nmanma.
Ndụ dịrị mo, a ga m'ekele Gị, ezi Chukwu.
K'anyị tuoro Ya nmanma.