Full Lyrics
[Bass Intro]
Ndị naatụkwasị Chineke obi gaadị ka ugwu Zayọn
[Chorus]
Ndị naatụkwasị Chineke obi
Ndị naatụkwasị Chineke obi
Gaadị ka ugwu, ugwu, ugwu Zayọn
Ugwu, ugwu, ugwu Zayọn
Ugwu, ugwu, ugwu Zayọn
Nke naadịghị ama jigi jigi
Jigi jigi jigi jigi
Ruo mgbe ebighị ebi
Ha dị ka ugwu Zayọn nke naadịghị ama jigi jigi
Ruo mgbe ebighị ebi.
[Soprano Solo]
Ndị naatụkwasị Chineke obi o!
Gaadị ka ugwu ugwu, Zayọn
Nke naadịghị ama jigi jigi
Jigi jigi o! Jigi jigi jigi jigi o!
Ruo mgbe ebighị ebi.
[Chorus]
Ugwu Jerusalem, ugwu ugwu ya, ugwu ya, ugwu ya
Rile gbara ya gburugburu, gburugburu gburugburu
Otua ka Chineke si agba ndị nke ya
Gburugburu gburugburu gburugburu o!
Ruo mgbe ebighị ebi
Ha dị ka ugwu Zayọn, ha dị ka ugwu Zayọn,
Ugwu Zayọn Ugwu Zayọn Ugwu Zayọn
Nke naadịghị ama jigi jigi
Jigi jigi jigi jigi jigi ma ncha
Jigi jigi jigi jigi jigi ma ncha
O! Jigi jigi jigi jigi jigi ma ncha
Ha dị ka ugwu Zayọn, Zayọn, Ugwu Zayọn, Zayọn
Nke naadịghị ama jigi jigi
Jigi jigi jigi jigi
Ruo mgbe ebighị ebi
Jigi jigi jigi jigi ma ncha
Ugwu Jerusalem e! e! Ugwu Jerusalem gbara ya gburu gburu ncha e!
Jigi jigi ma ncha e! Jigi jigi ma ncha
Otua ka Chineke si gbaa ndị nke ya gburu gburu e! e!
Jigi jigi ma ncha e! Jigi jigi ma ncha
Site n'ugbu a wee ruo
Site n'ugbu a wee ruo ebighị ebi Amen.
[Gloria Patri]
Otito dịrị Nna
Otito dịrị Nwa
Otito dịrị Mụọ Nsọ
Etu ọ dị n'izizi ka ọ dị ugbu a
Ọ gaadịgide otua ruo mgbe ebighị ebi, Amen
Amen, Amen, Amen, Amen, Amen
Amen, Amen, Amen, Amen Amen
Amen amen amen amen amen.