Full Lyrics
CHORUS
Ụmụ Chineke naranụ m rie nụ, naranụ m rie nri dị nsọ.
Ụmụ Chineke naranụ m rie nụ, naranụ m nụọ ọbara m o.
Nri n'enye ndụ, ndụ ebighebi,
Nri n'enye ndụ naranụ m rie nụ.
Nri ndị mmụọ ozi, Nri a si n'igwe gbadata,
Nri n'enye ndụ naranụ m rie nụ.
Ọ bụ Kristi n'akpọ gị, Ọbara m o.
Nwannem bịa naranụ m rie nri dị nsọ,
Nwannem bịa naranụ m nụọ ọbara m o.
Naranụ m rie nri dị nsọ,
Naranụ m nụọ ọbara m o.
Nwannem bịa rie nri si n'igwe gbadata,
Nri n'enye ndụ naranụ m rie nụ.
Nke ọgọzi Ọbara m o.
VERSE 1
Chukwu Nwa si n'igwe bịa n'ụwa,
Jesu Kristi bịa, a tara ahụhụ.
Ọ nwụrụ n'ihi mụ na gị,
Tupu Ọ lakwuru Nnaya.
Jesu mer' onwe ya Achịcha nke ndụ.
Achịcha si n'igwe, Ọ bụ nri n'enye n̄ụrị na ndụ ebighebi.
Jesu n'akpọ anyị.
VERSE 2
Ahụ m bụ ihe oriri,
Ọbara m bụ ihe ọṅụṅụ.
Nke a bụ okwu Nke Dinwenu kwuru.
Ony' ọ bụla, Onye nwe anyị kwuru sị,
Onye bụla riri ahụ m,
Ony' ọ bụla nụọ ọbara m,
Ọ nwe ndụ ebighebi.
Jesu kwuru, Ọ na kpọ anyị.
VERSE 3
Jesu Achịcha dị nsọ,
Jesu Ị dị nsọ.
Oge Nna m anyị ha nọ n'ọzara,
Chukwu nyere ha Achịcha si n'igwe mụdị manna.
Ma n'ugbua oge nke a,
Chukwu nyere m ụwa ya Jesu dịka Achịcha dị ndụ.
Jesu onye nzọpụta,
Jesu Nwa atụrụ chu aja.
Jesu Onye kpọchapụ njọ mụ na gị.
Jesu Achịcha dị nsọ,
Jesu Ị dị nsọ.
Jesu n'akpọ gị.