NARANU M RIE by JUDE NNAM — Lyrics

JUDE NNAM Igbo Communion Hymns Eucharistic songs Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Umu Chineke, naranu m rie nu, naranu m rie nu, naranu m nuo Obara Dinwenu. Nri n'enye ndu, ndu ebighebi. Nri ndi Muozi, naranu m rie nri di nso nri oma. Naranu m rie Nri si n'igwe gbadata. Obu Kristi n'akpo Gi, bia. Nwanne m, bia, Kristi n'akpo Gi. Nwanne m, bia, Onyenw'anyi n'akpo gi. "Naranu m rie, nke a bu Ahu mo. Naranu m nuo, nke a bu Obara mo, di nso nri oma. Naranu m nuo Obara mo. Nwanne m, bia rie nri si n'igwe gbadata. Iko ngozi, Obara Dinwenu." VERSE 1 Chukwu Nwa si n'eligwe bia n'uwa. O Jesu Kristi. O tara ahuhu, O nwuru onwu n'ihi mu na gi. Tupu O lakwuru Nna Ya. Jesu mer'onwe Ya, Achicha nke ndu. Achicha si n'igwe. Nri n'enye anuri ebighebi. Jesu n'akpo anyi. VERSE 2 Nke a bu okwu nke Dinwenu. Ony'obula, Ony'obula, Ony'obula nke rir'Ahu m, Ony'obula, Ony'obula, Ony'obula nke nur'Obara m, g'enwe ndu, Onye ahu g'enwe ndu n'ezie, ebighebi. Jesu n'akpo anyi. VERSE 3 Oge nna nn'anyi ha no n'ozara, Chukwu nyere ha achicha si n'igwe, n'udi manna. Mana ugbu a, n'oge nke anyi, Chukwu nyer'anyi Nwa Ya, Jesu Kristi, Achicha di ndu. Jesu, Onye nzoputa. Jesu, Nwatur'e jiri chu aja. Jesu, Onye kpochapuru njo mu na gi!

Download the sheet music

NARANU M RIE

NARANU M RIE

By JUDE NNAM
Staff & Solfa
Igbo
14 pages
1 Downloads
Communion Hymns Eucharistic songs Hymns
0 0

More lyrics you may want