Full Lyrics
INTRO
Anyị n'arịọ Gị Chineke
ezi Nna naranụ aja anyị
naranụ aja ekele ụmụ Gị butere n'ebe nsọ Gị
naranụ ya Nna doo
naranụ ya gozie
goziere ndị nke Gị bụ ndị gbakọrọ n'ebe nsọ Gị Chukwu Nna doo
CHORUS
Onye ebere doo
naranụ gozie
oh Onye onyinye
naranụ mmanya gozie
oh zite mmụọ nsọ Gị
Onye amara doo
naranụ gozie
oh Onye onyinye
naranụ achịcha gozie
oh zite mmụọ nsọ Gị
ka ọ gbanwoo ha
mee ha ka ha bụrụ ahụ n'ọbara nwa Gị
oh
VERSE 1
Nara aja anyị Ezi Nna
ezi Chineke dịka isi nara aja Ebel nwaodibo Gị chunyere Gị
naranụ ya gozie
dịka isi nara aja n'ukwu ụkọchukwu Gị Melkizedek chunyere Gị
Aja anyị n'achụrụ bụ Nna bụ aja mara mma oh
REFRAIN
Naranụ ya gozie Ezi Nna doo onye amara
VERSE 2
Aja anyị n'achụrụ Gị Nna si n'obi anyị
VERSE 3
Aja anyị n'achụrụ Gị Nna si n'ihe ala mịtara
VERSE 4
Aja anyị n'achụrụ Gị bụ aja inye Gị ekele
VERSE 5
Jụkwala onyinye anyị n'ihi na ọ si anyị n'obi
VERSE 6
Anyị n'arịọ Ezi Chineke