NARA ONYINYE ANYI N'OBI OCHA by Onuora, J.C — Lyrics

Onuora, J.C Igbo Consecration Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Chukwu Nna anyị abịala inye Gị ekele Nna nara onyinye anyị n'obi ọcha Etuchala mmehie niile anyị mere Nara ya biko Chineke ma gozie ya N'obi ebere Gị Etuchala mmehie niile ma nara ya Etuchala mmehie niile ma gozie ya. VERSE 1 Ezi Chineke nara onyinye ụmụ gị n'enye gị Ọ bụ onyinye si n'akụ n'ụba nke inyere anyị Anyị n'arịọ gị ezi Chukwu ka inara ya Dịka onyinye nwa odibo Gị Abel Abel na aja nke ụkọchukwu Gị Melkizedek. VERSE 2 Cheta mmiri ozuzo bụ onyinye Chineke nyere anyị n'efu Ọnwa na anyanwụ ha ncha bụ akọ ọrụ Chukwu Ikuku n'enye anyị ndụ bụ onyinye Chukwu Gịnị g'egbochi gị Gịnị g'egbochi gị Gịnị g'egbochi gị inye Ya ekele dị mma. VERSE 3 Oge rugo ụmụ Chineke Oge rugo Ngwanụ kunite, kunite nụ k'a gọ Kunite nụ k'anyị gaa kele Ya Maka ihe ọma dị iche iche O mere gị. VERSE 4 Lee onwe gị anya ka ị hụ ọrụ ebube Chineke rụrụ gị Mgbe ị nọ n'ọrịa Ọ bụ Ya n'eche gị Mgbe ị na gaa njem Ọ bụ Ya n'edu gị Oge erugo kunite kele Ya.

Download the sheet music

NARA ONYINYE ANYI N'OBI OCHA

NARA ONYINYE ANYI N'OBI OCHA

By Onuora, J.C
Solfa
Igbo
3 pages
3 Downloads
Consecration Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want