NARA ONYINYE ANYI N'OBI OCHA by Jude Nwankwo — Lyrics

Jude Nwankwo Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Chukwunna, nna, nna, nna Chukwunna. Nara onyinye anyị n'obi ọcha. Tuch' ammehie nile anyị mere, Nara ya biko Chineke ma gozie ya n'obi ebere gị. VERSE 1 Ezi Chineke nar' onyinye ụmụ gị n'enye gị, Nna ọ bụ onyinye si n'akụ n'ụba nk'i nyere anyị, Anyị n'arịọ gị ka ị nara ya dị k'onyinye Abel nw'odibo gị, na aja nk'ụkọchukwu gị Melkisedek. VERSE 2 Chi na mmiri ozuzo bụ onyinye Chineke nyer' anyị n'efu, Ọwa na anyanwụ, ha ncha bụ ọrụ aka Chukwu, Inweku ikuku anyị n'eku bụ onyinye Chukwu, Gịnị gaaghọ chi i nye y'ekele dị mma. VERSE 3 Oge erugo ụmụ Chineke, ngwanụ ngwanụ kulitenụ, Kulitenụ k'anyị ga nye ya ekele. Mak' ihuọma dị iche Chineke m'er' anyị, Ngwanụ, ngwanụ, kulitenụ k'anyị ga nye ya ekele. Lee onwe gị anya ka ị hụ ọrụ ebube Chineke rụrụ gị. Ngwanụ, ngwanụ, kulitenụ, k'anyị ga nye ya ekele. Mgbe ị nọ n'ọrịa ọ bụ ya zọrọ gị, nye gị ahụike, Ngwanụ, ngwanụ, kulitenụ k'anyị ga nye ya ekele. Mgbe ị n'aga njem ọ bụ ya n'edu gị, Ngwanụ, ngwanụ, kulitenụ k'anyị ga nye ya ekele. Oge erugo ụmụ Chineke, ngwanụ, ngwanụ, kulitenụ k'anyị ga nye ya ekele.

Download the sheet music

NARA ONYINYE ANYI N'OBI OCHA

NARA ONYINYE ANYI N'OBI OCHA

By Jude Nwankwo
Solfa
Igbo
4 pages
5 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want