Full Lyrics
VERSE 1
N'orir' ikpe azụ Jesu rịọrọ Nna Ya ka nzukọ
Ya bur' otu n'elu ụwa. Anyị n'arịọ gị
N'oriri nke taata, k'anyị nile soro n'irịọ Chukwu,
K'anyị ncha buru otu ahụ
N'ime Sakramenti dị asọ.
VERSE 2
Maka nzukọ k'anyị nile n'arịọ k'a ndị otu
Christi ju n'ihu n'anya ka obi mmadụ n'ụwa
Nile buru otu, kpọkọba mmadụ ncha n'akụkụ Gị,
K'anyị ncha buru otu ahụ
N'ime Sakramenti dị asọ.
VERSE 3
Anyị n'arịọ maka ndị otu Christi O Jesu,
Ghaa ha n'otu igwe atụrụ ka ha wee nọrọ
N'akpụrụ otu onye isi na nzukọ nke jikọrọ mmadụ ncha,
K'anyị ncha buru otu ahụ
N'ime Sakramenti dị asọ.
VERSE 4
Oge n'eru mgbe Sakramenti aghọ k'ikpochi,
Kpọbata anyị n'eligwe ka anyị soro ndị mmụọ
Ọma na ndị dị nsọ hụ Gị n'anya n'añụrị na ndokwa,
K'anyị binyere ebebe,
Itọ n'ime Otu dị ngọzi.