Full Lyrics
REFRAIN
Taa b'ubochi ndi nne, ndi nne anyi ekelee
Taa b'ubochi ndi nne, ndi nne nweb' anuri.
Taa b'ubochi ndi nne, ndi nne anyi ekelee
Aga m' ejinu gini kelee gi o, mama mo?
Chineke goziere m nne mo, mama mo, ezi nne.
Aga m' ejinu gini kelee gi o, mama mo?
Chineke goziere m nne mo, mama mo, ezi nne oma.
VERSE 1
Nne bu ok' ihe. Nne bu ok' oru.
Nne bu nnukw' ihe, Chukwu mo gozie mama.
Af' ime siri ike, Af' im' adighi mfe,
Af' ime n'enye nsogbu, mana nne mo buru m n'afo.
VERSE 2
Onw' itenani ka m noro n'ime afo nne mo,
Nne m tara ahuhu n'im' oke mgbu wee muo mo.
Ok' echiche nile, any' abali nile.
Nne m tara ahuhu n'im' oke mgbu wee muo mo.
VERSE 3
Mary b'ezi Nne! Afo muru Jesu b'ezi Nne!
Nne nk'uwa nile, Mama anyi o! Nne anyi o!
Mama m bu ezi nne! Afo muru m bu ezi nne!
Chineke gozie ndi b'ezi nne! Mama mo! Ezi nne m'oma!