Full Lyrics
REFRAIN
Otito dịrị Chineke n'elu,
n'elu kach'elu.
N'ụwa, udo dịịrị ndị mmadụ,
ndị nwe'ro obi ọma.
VERSE 1
Anyị ajaa Gị mma.
Anyị agọzie Gị.
Anyị esekpuoro Gị.
Anyị etoo Gị.
Anyị ekele Gị n'ihi nnukwu ebube Gị.
VERSE 2
Osebulụwa Chukwu, Eze nk'igwe.
Chukwu Nna ji ike nile.
Dinwenu Jesu Kristi,
s'otu Nwa Chineke mụrụ.
VERSE 3
Dinwenu Chukwu.
Nwaatụrụ nke Chineke.
Nwa nke Nna.
Gị Onye n'ekpochapụ njọ,
njọ nk'ụwa, meere anyị ebere.
VERSE 4
Gị Onye n'ekpochapụ njọ,
njọ nk'ụwa, nara arịrịọ anyị.
Gị Onye nọ n'aka nri Nna,
meere anyị, meere anyị ebere.
VERSE 5
N'ihi na sọ Gị dị Nsọ.
Sọ Gị bụ Dinwenu.
Sọ Gị, O Jesu Kristi,
sọ Gị eh, sọ Gị dị Nsọ.
VERSE 6
Kachasị dị elu.
Gị na Mmụọ Nsọ.
N'ebube Chukwu Nna,
Chukwu Nna.
Amen.
Amen.